Egwu Ọdịnala Igbo: Ngwaọrụ E Ji Azụlite Ụmụaka
Keywords:
Egwu Ọdịnala, Igbo, UmuakaAbstract
Egwu nwere ikike dị egwu n’iji zisaara ọhanaeze ozi dị mkpa, ma bụrụ otu ụzọ e si azụlite ụmụaka n’ihe ga-abara ha uru na ndụ. Ọ bụ ihe na-agba anya mmiri na nleghara anya ụfọdụ ndị na-elekọta ụmụaka leghaara iji egwu ọdịnala na-azụlite ụmụaka na-etolite etolite n’oge ugbua. Ọnọdụ a so ebute agwa ọjọọ dị iche iche a na-ahụ n’etiti ndị na-etolite etolite. Ebumnobi nchọcha a bụ: izipụta ụzọ a ga-esi kwalite egwu ọdịnala Igbo dịka ngwaọrụ a ga-eji na-azulite ụmụaka na-etolite etolite n’ịkpa ezi agwa maka ọdịmma obodo. Nchọcha a ga-emekwa ka ọnọdụ egwu ọdịnala Igbo kwudosie ike. A gbasoro Atụtụ Nzụlite Ụmụaka nke Thompson Ross (2008) dere. A gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ site na mpaghara ala Igbo dị iche iche iji chịkọta egwu ọdịnala maka ụmụaka. A gbadoro ụkwụ n’ajụjụ nchọcha anọ wee nweta ngwaọrụ e ji mee nchọcha a. Ha bụ: (a). Olee egwu ọdịnala dị iche iche e ji azụlite ụmụaka n’oge gboo? (b). Ndị na-elekọta ụmụaka a ka ji egwu ọdịnala azụlite ụmụaka n’oge ugbua? (ch). Kedụ ọghọm dị n’ileghara egwu ọdịnala anya wetere n’ọnọdụ ịzụlite ụmụaka? (d). Zipụta ụzọ a ga-esi kwalite egwu ọdịnala ka ọnọdụ ya wee kwụrụ chịm? A chọpụtara n’ọtụtụ ndị na-elekọta ụmụaka anaghịzị enwekebe mmasị n’egwu ọdịnala, mezịa ka ịmụta ezi agwa n’ebe ụmụaka nọ na-ama afọ n’ala. Nchọcha a ga-enye aka n’ịhazi akparamagwa ụmụaka maka ọdịmma obodo. Ọ dị mkpa ịlaghachi azụ n’iji egwu ọdịnala azụlite ụmụaka ka obodo wee nwee agamniihu. Egwu dị nnkwu mkpa ma bụrụ ihe mmadụ apụghị ileghara anya na ndụ.