ǸKÀM̀MÁ: NZIPỤTA ỌNỌDỤ EGWU N’ETIMMỌNWỤ IJELE
Abstract
Edemede nchọcha a lebara anya n’ọnọdụ egwu dịka otu n’ime ụzọ pụrụ iche e si ezipụta nkamma dị n’etimmọnwụ Ijele. Ebumnuche edemede a bụ ka e si na ya chetara ụmụafọ Igbo ọrụ egwu na-arụ na ndụ mmadụ. Mmụọnwụ Ijele nwere egwu dị iche iche e si na ha ezipụta nkamma, ma were ha na-egosi na ọnọdụ ya dị elu na ndụ ndị Igbo. N’agbanyeghị ihe ndị a e zipụtara n’elu ebe a, egwu ndị ahụ enwetabeghị ọnọdụ kwesịrị ha n’edemede nchọcha. Ọ bụ echiche dị etu a kpalitere mmụọ edemede a, ka e wee si na ya zipụta mkpa egwu dị n’etimmọnwụ Ijele. Ọ bụ n’agụmagụ ọdịnala ka e mere nchọcha a, bụ nke na-ezipụta isiokwu banyere nkamma na ọnọdụ egwu nọ na ndụ ndị Igbo, site n’ihe a hụrụ anya, ajụjụ ọnụ, ọba akwụkwọ na ịntanetị. Atụtụ e ji wee tụchaa edemede nchọcha a bụ atụtụ keimechiche, nke na-ele ọrụ nka anya site n’etu o si agba ama echiche onye ọrụ nka ahụ. A tụchara azịza dị iche iche e si n’ụzọ ndị a nweta, nke e si na ha chọpụta na egwu nwere ọnọdụ pụrụ iche n’etimmọnwụ Ijele, ma bụrụkwa omenala e si na ya ezipụta ọnọdụ ndị mmadụ, ọdịnala ha, nkwenye ha na nsirihụndụ ha. Egwu mmụọ Ijele nwere nkamma atọ, gụnyere nkamma kentị, keanya na keọnụ. Edemede nchọcha a ga-abara ọha na eze na onye ọ bụla nwere mmasị na nkamma, egwu na mmọnwụ Ijele uru.