Agụ nwa na-ebu n’Ala Igbo: Mgbazi Olu Sitere n’Akwụkwọ Eriri Mara Ngwụgwụ na Obidiya

Authors

  • OLEKAIBE, CHINENYE C. Ph.D Author

Abstract

Ndị Igbo kwenyere na ama nwa na-anọghị bụ ama chọrọ ichi echichi nke kacha njọ nye nwa nwoke. Nke a mere na onye Igbo ọ bụla na-agba mbọ ịhụ na nwa batara n’ime ezinụlọ ya site n’ụzọ ọ bụla o nwere ike. Ụdị mbọ ndị a edunyela ọtụtụ ụmụafọ Igbo, ma ndị nwaanyị ma ndị nwoke, n’ime mgbagharị. Ọ bụ ya kpaliri mmụọ odee iji chọọ ịmata ka ọnọdụ a siri dị n’isiokwu a n’ime akwụkwọ Eriri Mara Ngwụgwụ na Obidiya. Nchọcha a chọpụtara na iji anya ọjọọ achọ nwa nwere ike itisa ezinụlọ ma wetara ndị metụtara ya ihe ihere, dịka e si hụ ya n’ime akwụkwọ Eriri Mara Ngwụgwụ. Ọchịchọ nwa na-akara ụmụnwaanyị njọ karịa ụmụnwoke. Ọzọkwa, ọnọdụ enweghị nwa na-edubakarị nwoke ịlụ nwaanyị ọzọ. Nwoke dimkpa na-enweghị nwa nwoke nwekwara ike ime ka ụmụnna ya zọọ akụnaụba ya ma ọ dị ndụ ma ọ nwụọ anwụọ. N’agbanyeghị nke a, di na nwunye nwekwara ike ibi n’udo ma hụkwa onwe ha n’anya, n’agbanyeghị na ha amụtaghị nwa, dịka e si gosipụta ya n’ime akwụkwọ Obidiya.

Downloads

Published

2026-10-19