ANYAUKWU: ỌNỌDỤ A HỤRỤ NA NDỤ NDỊ MMADỤ DỊKA E SIRI HỤ YA N’EJIJE NDỊ ỤFỌDỤ
Abstract
Ndị Igbo kwenyere na ezi ndụ ka mma karịa ndụ ọjọọ n’ihi na ndụ ọma na ndụ ọjọọ nwere ụgwọ ọrụ na-eso ha. Ọ ka mma na mmadụ nwetara ezigbo ụgwọ ọrụ sitere na ndụ ọma karịa ntaramahụhụ sitere na ndụ ọjọọ. N’ụzọ ndụ ndị Igbo na omenala ha, e nwere omume ma ọ bụ agwa ọjọọ ndị ha na-ahụta dị ka ihe jọgburu onwe ya na njọ. Ụfọdụ n’ime agwa ndị a gụnyere anyaukwu, igbu mmadụ, izu ohi, ịkpọ mmadụ asị, dgz. Nchọcha a gbakwasịrị ụkwụ n’anyaukwu dịka otu n’ime agwa ọjọọ ndị Igbo na-agbakwuru ihu. Mbawanye anyaukwu bụ okwu a na-anụkarị n’ala Igbo taa. Nke a mere ka ebumnuche nchọcha a bụrụ ịchọpụta ihe na-akpata anyaukwu na ntaramahụhụ na-esi n’anyaukwu apụta, ụzọ a ga-esi ebelata anyaukwu, ụzọ dị iche iche ndị odee ejije Igbo a họọrọ siri zipụta anyaukwu na ntaramahụhụ so n’ejije ha, yana etu a ga-esi amata ntaramahụhụ ndị ahụ site n’ihe ndị mmadụ derela n’ejije Igbo. Ihe e ji mee nchọcha a bụ akwụkwọ ejije Igbo atọ ndị a họọrọ, nke gụnyere Obidiya nke Akọma (1977) dere, Ọkụ Ghara Ite (1988) nke Goddy Onyekọnwụ dere, na Akwa Nwa (1979) nke Chukuezi dere. Atụtụ nchọcha a gbasoro bụ atụtụ ngụgụ iji nyochaa agụmagụ ndị a. Atụtụ a na-akọwa ka odee si webata nkwenye ọma ma jiri ya na-akwado omume na agwa dị iche iche n’edemede ya. Usoro nchọcha a gbasoro bụ nchọcha sọvee. Site na nchọcha e mere, a chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị eche banyere ntaramahụhụ na-eso ụfọdụ agwa ọjọọ ha na-akpa. N’ikpeazụ, onye nchọcha chịkọtara nchọcha ya site n’inye ndụmọdụ ka onye ọbụla nwee afọ ojuju n’ihe ọbụla o nwere. Ọ dịkwa mkpa ka nne na nna bịaruo ụmụ ha nso iji mata ọnọdụ ndụ ha na ụdị agwa ụmụ ha na-akpa. Nke a ga-enyere ha aka ịmata etu ha ga-esi dọọ ha aka ná ntị ma ọ bụ gbazie ha n’oge kwesịrị ekwesị.