Agụmagụ Ọnụ Dị Ka Ebe Nhiwe Isi, Agụmagụ Ederede, Nleba Anya n’Agụmagụ a Karụsịrị na Ngene na Nwata Rie Awọ
Keywords:
Agụmagụ, edereede, IgboAbstract
Agụmagụ ọnụ ebe nhiweisi agụmagụ edereede na-akọwa na agụmagụ edereede nwere ebe ha gbadoro ụkwụ wee malite, ha anọkataghị bido. Ndị Igbo na-eche na agụmagụ Igbo pụtara ihe na nlegara anya afọ 1935, ha amaghị na agụmagụ ọnụ/ọdịnala dịrịị, kama, enweghi ebe e bipụtara ha, n’ihi na ewezuga agụmagụ ọnụ/ọdịnala, agụmagụ edereede agaghị enwe mgbọrọgwụ ọ ga-esi na ya too eto. Na nchọcha e mere, a chọpụtara n’akwụkwọ mbụ ndị Igbo dere n’oge ndị oziọma ndị ọcha nọ, n’afọ 1930–1961, mgbe ndọrọndọrọ ọtọgrafi biri, nwere ụfọdụ ihe a na-ahụ n’agụmagụ ọnụ/ọdịnala nke pụtara ihe na ya. E wezụga Ọmenụkọ, e dere n’afọ 1935, akụkọ ndị ọzọ gbadokarịrị ụkwụ n’akụkọ ifo dịka Ala Bingo na Elelia na Ihe O Mere. Ndị odee agụmagụ Igbo malitere iwebata ụfọdụ ihe dị n’agụmagụ ọnụ/ọdịnala dịka akụkọ ifo, omenala, nkwenye, obibi ndụ, ejiji, emume ndị Igbo na ndị ọzọ n’ime agụmagụ edereede ha. Ihe ndị a niile bụ ihe dị n’agụmagụ ọnụ. Ihe a niile mere onye nchọcha ji gbado ụkwụ n’agụmagụ odee ndị a họọrọ iji zipụta ka ndị odee agụmagụ Igbo si ezipụta agụmagụ ọnụ n’edereede ha. Onye nchọcha chọpụtara na e wepụsịa ihe ndị a niile n’agụmagụ edereede Igbo, ọ gaghị ezu oke ịbụ agụmagụ Igbo, n’agbanyeghị na ọtụtụ odee ji asụsụ Bekee ezipụta obibi ndụ na ihe banyere ndị Igbo n’agụmagụ ha. A gbasoro usoro nkọwa wee mee ka ọhanaeze mata na a gaghị ewezuganwu agụmagụ ọnụ/ọdịnala n’ime agụmagụ edereede, n’ihi na ọ bụ mmewere ya. Ọzọ bụ ka ndị odee ọhụrụ kwaa ahụ na-agbaso usoro a.